Onyeisioche Christian Association of Nigeria (CAN), na steeti Kaduna, Rev. Joseph John Hayab ekwuputala na ụkọchukwu katọlik, Fada Joseph Bako, onye ndị ntọrị tọọrọ na Maachị afọ a bụ 2022, anwụọla ebe ha ji ya.
Hayab gwara ndị ntaakụkọ na ndị ahụ tọ́ọ́rọ́ ụkọchukwu ahụ gbùrù ya. Ọ sị: “Anyị na-aga n’ihu na-eli ndị mmadụ, ndị ndu ụka, n’ihi ahazighị ọnọdụ ezi nchekwa na steeti anyị tinyere ala anyị.”
A tọọrọ Fada Joseph, onye gbara afọ iri anọ na asatọ n’ụlọ ya dị na St John Catholic Church, Kudenda, ebe ọ na-agba odibọ dịka ụkọchukwu parish, ka ọnwa Maachị dị n’abalị asatọ n’afọ a bụ 2022.
E kwuru na ahụ adịghị Fada Joseph oge a tọọrọ ya, ma ha ekweghị ka o were ọgwụ ya.
Onyeisioche CAN kọwara na ndị nọ mgbe ha gburu ya, bụkwa ndị a tọọrọ atọrọ gbara ama na e gburu ya egbu n’ezie.
Kaosiladị, Achịbishọp Kaduna, ‘Most Rev.’ Matthew Man-Oso Ndagoso, ezigarala ezinaụlọ Fada Joseph Bako lara mmụọ na ndị ụka St. John Kudenda ozi nkasiobi; ma kwe ha nkwa ezi mmekọrịta na ekpere.