E liela ozu Deborah ụmụakwụkwọ Sokoto e tigburu na steeti Niger

0
8
Deborah ahụ e tigburu
Deborah ahụ e tigburu

ANYAMMIRI zoro ka mmiri na nsonso a ka a dọnyere ozu Deborah Yakubu n’ala, n’obodo ya dị na steeti Niger.

  Ọ bụ nnọọ oge nnukwu ihe mgbu dịka nne na nna, ikwunaibe tinyere ndị o metụtara n’obi bere akwa akwụsị akwụsị mgbe a dọnyere ozu ya n’ime ala, na Tunga Magajiya dị n’okpuru ọchịchị Rijau nke steeti Niger.

  E kwuru na nne ya koropuru na Tọzdee izuụka gara aga, mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ ntụmadị nwa ya nwaanyị, ma nke bụ nsogbu dapụtara n’obodo ahụ mgbe e bulatara ozu ya na Satọdee.

  E nwere obere nghọtahie tupu e lie ozu ya n’ihi na ndị ntorobịa obodo ahụ kwuru na elimozu ya kwesịrị ịbụ oke na ọrụ dịịrị gọọmenti steeti Sokoto, ebe ezinaụlọ kwuru na a ga-eli nwa ha nwaanyị n’enweghị njikọaka gọọmenti.

  Ka nke ahụ gachara, e liziri ozu Deborah ka o ji ihe dịka ọkara gafee elekere isii nke mgbede, n’ebe elimozu ndị otu Kraịst (Christian Cemetry), dị na Tunga Magajiya. Onye nọ n’isi ekpere tupu a dọnye ozu ya n’ala bụ nwanne nna ya, Emmanuel Maaji, bụ Pastọ n’ulọụka ECWA dị na Tunga Magajiya.

  Ọ dị ncheta na Deborah Yakubu bụ nwata akwụkwọ na Shehu Shagari College of Education, Sokoto, tupu ụmụakwụkwọ ibe ya na-ekpe ekpemekpe Islam egbuo ya maka ihi na ha sị na ọ kparịrị Mohammed.

  N’ihi ọnọdụ a, nne ya bụ Oriakụ Alheri Emmanuel ekpebiela ma kwuo na o nweghị nwa ya ọzọ, n’ime ụmụ asaa fọọrọ ya, ga-aga akwụkwọ, ka ha wee gbanahị ụdị ọdachi dapụtara n’ebe Deborah nọ.

  Ọ gara n’ihu kwuo n’obi mwute sị: “Ihe mere m bụ obe nke bịara m, aga m eburịrị ya; mana o nweghị otu n’ime ụmụ asaa fọọrụ m ga-aga ụlọakwụkwọ ọzọ.”

  Gbasara ihe ọ chọrọ n’aka gọọmenti, ọ sị: “Achọghị m ihe ọbụla n’aka gọọmenti, ezinaụlọ a achọghị ihe ọbụla site n’aka gọọmenti. Chukwu ji ike niile ga-ewere ọnọdụ.”

  N’akụkụ nke ya, nna Deborah bụ Maazị Emmanuel Garba kwuru na dịka ezigbo ndị otu Kraịst, na ya na ezinaụlọ ya ekpebiela na ha agaghị aga ụlọikpe n’ihi ọnwu nwa ha nwaanyị, kama na ha hapụrụ ihe niile n’aka Chineke.

   Chineke ji ụmụ asatọ gọzie Maazị na Oriakụ Emmanuel Garba, Deborah lara mmụọ bụ onye nke mbụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here