Gọọmenti Anambra ekwela nkwà ikwàlitè ọnọdụ ahụike ọhaneze

0
9
Osote Gọvanọ Anambra, Dọkịta Onyekachi Ibezim (n'etiti) na ndị ọzọ oge ọ na-agbape ụlọ ahụike ahụ
Osote Gọvanọ Anambra, Dọkịta Onyekachi Ibezim (n'etiti) na ndị ọzọ oge ọ na-agbape ụlọ ahụike ahụ

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo agbapeela ogige nlekọta ahụike ọhụrụ a maara dịka ‘Dame Irene Okwuosa Memorial Hospital’ n’Oraifite dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ewusigo.

  N’okwu ya oge ọ na-agbape ụlọ ahụike ahụ, Gọvanọ Soludo mere ka a mara na ala Nigeria nọ n’ogoogo nke iri atọ na otu n’ebe e nwere ọnwụ sitere n’ọrịa obi, ma kwuo na ụlọọgwụụ obi ahụ ga-enyere ndi Anambra aka ilekọta ọnọdụ ahụike ha, okachasị dịka o siri metụta ọrịa Ibi.

  Gọvanọ Soludo, nke ọ bụ osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kwuru na ahụike so n’ezi ihu n’atụmatụ ọchịchị ya ji n’aka na steeti Anambra, ma kwukwa na ọchịchị ya ga-enye ya bụ ọmarịcha ụlọ ahụike ezi nkwàdo zuru òkè.

  O kelere onye rụrụ ya bụ ụlọ ahụike, bụ Emeka Okwuosa maka iwèlàtàrù akụnụba ya ụlọ site n’ịbịa wuo ya bụ agidigba ụlọ ahụike, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ụmụafọ steeti ahụ ka ha ṅomie ya.

  N’okwu nke ya na mmemme ahụ, onye guzobere ya bụ ụlọọgwụ ‘Dame Irene Okwuosa Memorial Hospital, Oraifite’ bụ Injinia Emeka Okwuosa, kwuru na ụlọọgwụ ahụ, nke o guzobere ná ncheta nne ya nwụrụ anwụ, bụ Dame Irene Nneka Okwuosa, ga-enye ezi nlekọta ahụike, ọkachasị n’ihe metụtara ọrịa obi na ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ, bụ nke ọ sị na ọtụtụ ụmụafọ Nigeria na-agakarị mba ofesi were enweta. Ọ sịkwa na ha ga-enye ezi nlekọta ahụike bụ ọkachamma n’ụlọ ahụike ahụ maka onye ọrịa ọbụla bịara n’ebe ahụ.

  Okwuosa, onye bụkwa onye hibere òtù ọrụ obiebere a maara dịka ‘Sir Emeka Okwuosa Foundation’ kwukwàrà na ụlọọgwụ ọpụrụiche ahụ ga-enye nkwàdó pụrụ iche na mbọ ahụ gọọmentị na-agba ibèlàtà ọnwụ nne na ụmụaka na steeti ahụ, ibèlata mgbasa nke ọrịa na-efe efe a pụrụ igbochi egbochi, nye ohere ịwa ahụ n’ọnụ ego dị ala maka iwepu akpụ na etuto n’ahụ mmadụ, tinyere ịzụpụta ọtụtụ mmadụ n’ịbụ ọkaibe na ndị ọkà mmụta n’ihe gbasaara sayensị na nlekọta ahụike ọhaneze, ọbụladị dịka o kèlèkwàrà òtù ‘VOOM Foundation, USA’ maka nkwàdó ha pụrụ iche.

GUO:  Ndị na-azụ añụ n’Anambra emeela ụbọchị añụ

  Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù VOOM Foundation, bụ Shawn Pallone, kwuru na mmekorita ahụ dị n’etiti òtù ahụ na ụlọọgwụ ahụ amịtala ezi mkpụrụ ma nyekwa ha ohere inyeghachi ọhaneze na ịtụnye ụtụ nke ha n’ịkwàlite ọdịmma obodo na ọhaneze, ọbụladị dịka o kwèrè nkwà na ya bụ njikọaka na mmekọrịta ga-adịdige ma kawanyekwa mma.

  N’akụkụ nke ya, onyeisi nhazi òtù ‘Sir Emeka Okwuosa Foundation’ bụ Amanda Obidike merè ka a mara ebumnobi òtù ahụ, ihe dị icheiche ha na-eme, na ụzọ dị icheiche ha sigoro tụnye ụtụ na mmepe obodo na n’inyere ụmụ mmadụ aka.

  Ya bụ nnukwu mmemme dọtàkwàrà ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ nà mpụga ya, nke gụnyere eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Alfred Achebe; eze ọdịnala Oraifite, bụ Igwe Daniel Udoji; Bishọp Samuel Ezeofor nke ụka Angịlịkan na dayọsisi Aguata; Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Afam Obidike; onye ọrụ obiebere, bụ Prince Arthur Eze (nke ọ bụ Dọkịnta Emeka Eze nke ụlọọgwụ ‘Toronto Hospital, Onitsha’ nọchitere anya ya); Chiifu Innocent Chukwuma nke ụlọọrụ Innoson; onye bụbu onyeisi ọchịchị obodo Orafite, bụ Chiifu Ralph Wike, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

  Ikpughe mbadamba nkume ntọala ụlọọgwụ ahụ, ịgbape ya bụ ụlọọgwụ n’ozuzu oke, na inyocha ụlọọgwụ ahụ na akụrụngwa dị icheiche dị na ya so n’ụfọdụ ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here