Ihe Kanu gwara m kà m gàrà leta ya n’ụlọ DSS – Soludo

0
9

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo emeela ka a mara na onye ndu ndị òtù ‘Indigenous People of Biafra (IPoB)’ bụ Mazi Nnamdi Kanu adịghị enwe obi ụtọ banyere ajọ mkpamkpa dị icheiche ndị Ojiegbe na-akpa na steeti ahụ nà ná mpaghara ala Igbo n’izugbe.

  Gọvanọ Soludo kwuputara nke a mgbe ọ na-eme ka a mara banyere nleta ọ gara leta Mazi Kanu n’ụlọnga ndị DSS, nàkwà ebumnobi o jiri gaa ya bụ njem.

  Dị ka o si kwuo, ọ gara njem nleta ahụ iji kwunyere nwa amadi ahụ, ma mekwa ka a mara na nke ahụ so n’ótù n’ime nzọpụụkwụ ya na mkpọtụrụ ya iji wètá udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ̀ na steeti ahụ nà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria n’izugbe.

  O kwuru nà n’agbanyeghị na Kanu nwere oke ọṅụ màkà obịbịa ahụ ọ bịara ileta ya, ma soro ya kparịta ụka nke ọma; na o (Kanu) kwuputakwara mwute ya maka etu igbusi mmadụ na ụdị arụrụala na omekoome ndị ọzọ sizị̀ arị ibe ya elu n’ala Igbo taa, tinyere iwu onye apụ̀tàkwala iro ahụ ndị omekome tìrì ma na-etinyekwa ya n’ọrụ na mpaghara ala Igbo taa n’aha ndị IPoB.

  Gọvanọ Soludo kwukwara na Kanu kwuru na ọ ga-amasị ya ma ọ bụrụ na a ga-enye ya ohere iji ọnụ ya wee gbasaara ndị na-eso ụzọ ya ozi  n’onwe ya, dụọ ha ọdụ ma gwakwa ha okwu ka ha gbaso udo.

  Ya bụ Gọvanọ kwukwazị̀rị̀ na o nwere nzọpụụkwụ ahụ ọ na-abagide na ya ga-amị̀ta mkpụrụ a tụrụ anya n’iweghàchìtè udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ̀ na steeti Anambra nà n’ala Igbo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here