N’Anambra, Kọmishọna Nwosu agaala njem mkpọtụrụ ụlọọrụ ANPC

0
8
Onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife (n'aka ekpe) oge ọ na-enye Kọmishọna Paul Nwosu (n'etiti) akwụkwọ akụkọ National Light ka o dughàrìchàrà ya na gburugburu ụlọọrụ ahụ.

KỌMISHỌNA ọhụrụ na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, bụ  Paul Nwosu awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportslightXTRA na Homeland. Ọ bịara njem ahụ iji chọpụta etu ọrụ si aga ebe ahụ, ma marakwa ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ.

 Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara Kọmishọna ahụ nke ọma. Dịka ọ na-edugharị ya na ngalaba dị icheiche n’ụlọọrụ ahụ, Nnabuife mèrè ka ọ mara banyere mbọ niile ụlọọrụ ahụ na-agba, n’agbanyeghị ihe icheakamgba dị icheiche ha nwere; ma kpọkuo gọọment steeti nke Ọkammụta Soludo nọ n’isi ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

 Ọ gara n’ihu kọwaa na kemgbe ọ malitere ọrụ dịka Onyeisi ANPC, na ha na Minịstrị na-ahụ maka mgbasaozi nọ n’ezi mmekọrịta, bụ ndị gọọmenti ga-esi n’aka ha haziere ha ọnọdụ.

  Dịka o siri kwu, ihe ha chọrọ n’aka gọọment gụnyere inye aka mezie ụfọdụ akọrọngwa ndị e ji arụ ọrụ, mebiri emebi bụ ndị ụlọọrụ ahụ apụghị idozi; ma bụrụ ihe ndị ga-akwalite ezi ọrụ. Ihe ndị ahụ gụnyere igwe e ji ebipụta ma na-ebe akwụkwọ, nnukwu igwe na-enya ọkụ iji hụ na ọkụ na-adị mgbe niile, kọmputa, tebulu, oche, igwe ntụoyi a ga-etinyegasị ebe o kwesịrị.

  Ọ sị: “Ọ bụrụ na m jiri igwe a bipụta akwụkwọ, aga m enwe uru otu nde naịra. Oge m malitere ọrụ ebe a n’afọ 2014, ahaziri m ma leruo ya anya n’ihi na ọ tọgbọrọ na nkịtị, oge ahụ.”

  O kwuru na ha na-aga n’ihu n’ọrụ n’agbanyeghị etu ọnọdụ siri dị. O kwuru na akwụkwọ akụkọ National Light na-apụta kwa ụbọchị n’ikuku (online), e wepụ sọọsọ ụbọchị Tọzdee ha ji ebipụta ya na Ka Ọ Dị Taa tinyere SportslightXTRA n’ihi na ha enweghị ego ibipụta ha kwa ụbọchị.

GUO:  Ọtụtụ ndị mmadụ ezigarala Soludo ozi ekele ka ọ natachara asambodo

  E jikwa ohere ahụ gosi Kọmishọna ahụ ụlọ ọhụrụ ICT Enterprise Centre, bụ nke e ji ego sitere na ngalaba na-ahụ maka azụmahịa n’ụlọọrụ ahụ wee rụọ.

  N’okwu nke ya, Kọmishọna Nwosu nyere ndị ọrụ ahụ ndụmọdụ ka ha gaa n’ihu ịgba mbọ n’ọrụ ha, bụ nke o kwuru ga-eme ka ha rụpụta ezi ọrụ. Ya mere, o kwuru sị: “Nlekọta dị ezi mkpa n’ihi na ọ na-eme ka akụrụngwa ndị a e ji arụ ọrụ nọọ ọdụ. Achọrọ m ihụ na onye ọbụla n’ime ụnụ na-arụsi ọrụ ike. Ihe ụnụ rụpụtara n’ọrụ ga-ekpebi ọnọdụ ụlọọrụ a. Ya mere, ana m akpọku ụnụ, ka ụnụ na-arụ ọrụ na-aga n’ihu iji kwalite steeti Anambra na ndị mmadụ nọ n’oge ugbu a.”

  Kọmishọna Nwosu na Onyeisi, tinyere ndịisi ngalaba dị icheiche n’ụlọọrụ ANPC, nọkwara nzukọ ebe ha nọrọ tikọta isi ọnụ, gbaa izu maka ọdị mma ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here