National Hospital Abuja ekwuola na ozu Osinachi anaghị agụ egwu n’ụlọ nchekwa ozu

0
7

Ụlọọgwụ National Hospital, Abuja, ekwuputala na onye ọgụ egwu ụka, bụ Osinachi Nwachukwu lagoro mmụọ, onye ndị mmadụ kwuru na ozu ya na-agụ egwu n’ọbaozu, anaghị agụ egwu obụla n’ebe ahụ, ma kọwaa ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwu dịka nnukwu asị chara ọkụ.

 Okwuputa okwu ụlọọgwụ ahụ, Dọkịnta Tayo Haastrup kwuru na o nweghị ihe e ji n’aka nke gosịrị na ozu Osinachi nọ na-agụ egwu n’ọba ozu.

 Dịka Haastrup siri kwu, onye nwụrụ anwụ enweghị ikike ịnọ n’ọbaozu na-agụ egwu.

 Ọ dị ncheta na Osinachi bụ onye otu ukwe n’ụlọụka Dunamis International Gospel Center, Abuja, nwụrụ onwa olemole gara aga n’ihi mkpagbu na mmerụ ahụ o nwetere n’aka di ya, Peter Nwachukwu .

 Ya mere dịka ọ nwụrụ, a dọnyere ahụ ya n’ọba ozu National Hospital, ndị mmadụ nọkatara wee kụba asịrị na onye na-eleta ozu n’ụlọọgwu ahụ kwuru na ozu Osinachi na-agụ egwu ya na-ewu ewu nụ ‘Ekwueme’, n’ọbaozu ahụ, n’etiti abalị.

  N’okwu ya banyere asịrị ahụ, Haastrup kwuru sị na ya bụ ihe enweghị ike ime eme, ma kọwaa ya dịka echiche na ihe ndị mmadụ bu n’obi. Ọ jụrụ ajụjụ sị: “Onye nwụrụ anwụ, bụrụ ozu, olee etu onye dị otu ahụ ga-esi na-agụ egwu n’abalị?”

 Gbasara mpụtara nnyocha e mere ozu Osinachi, iji chọpụta ihe gburu ya (autopsy), ọ kọwara na agaghị agba ya n’anwụ ma kwuo na IPO okwu ahụ dị n’aka ga-enye ya IGP, bụ onye ga-enyezi ya ụlọikpe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here