Ndị amị awakpola ogige ndị ojiegbe, gbuo ụfọdụ n’ime ha

0
8
Ndị amị awakpola ogige ndị ojiegbe, gbuo ụfọdụ n'ime ha

ỤBỌCHỊ niile nwere ike bụrụ nke onyeohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ.

  N’ịgbaso nke a, ndị ọrụ agha ala Nigeria nọrọ na nsonso a wee wakpo ogige ebe nzuzo ndị ojiegbe, bụ ndị a maara dịka ‘Unknown Gunmen’ dị n’Orlu na steeti Imo, wee chụọ ha ọsọ ụkwụ eru ala, bibie ma bukọtasịkwa ihe dị icheiche ha ji akpa ike.

  Ọ dị ncheta na ndị ojiegbè a bụ ndị omekoome ahụ na-emekpa ndị mmadụ na obodo dị icheiche ahụ na mpaghara ebe dị icheiche, ma na steeti Imo na steeti Anambra, ọkachasị mpaghara Ihiala, Orsumoghu, Azia, Ebenator, Ezinifite, Ukpor, Ụtụh, Nnewi na mpaghara ebe ndị ọzọ ha kpagoro ike dị egwu na nsonso a. Ọ bụkwa ha bụ ndị malitere ịga n’obodo n’obodo na n’ụlọ n’ụlọ na nsonso a wee na-anakọrọsị ndị ọrụ nchekwa obodo dị icheiche egbe ha ji arụ ọrụ. Ọ bụ ha bụkwa ndị ahụ meerela ka ọ bụrụ iwu na onye ọbụla ga-akwa ozu maọbụ mee nnukwu mmemme ọbụla na mpaghara obodo ebe ahụ ha kacha akpa ike ga-abịarịrị ịhụ ha anya, nye ha ihe ha na-eri, ma chọọrọ ha ego mgbọ; emeghị ma ya, ha abịa jiri egbe mebisie ihe ebe ahụ ụbọchị ahụ.

  Ọ bụ n’ihi nke a ka ndị ọrụ agha a jiri hazie ma kwado onwe ha nke ọma wee wakpò ebe nzuzo ha, bụ ebe ha na-anọ ahazi onwe ha ma na-akwado ọrụ, dị n’Orlu dị na steeti Imo, ma chụọ ha ọsọ n’ebe ahụ.

  Dịka ozi a kụpụrụ banyere nke ahụ na nsonso a site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi ala Nigeria, bụ Brigadier General Onyema Nwachukwu siri kọwaa, ndị omekoome ahụ na ndị amị ahụ kwàrà mgbọ dị egwu oge ha na-achọ ịbata ebe ahụ, n’ihi na ndị omekoome ahụ busoro ha agha  dị egwu, iji wee gbochie ha.

GUO:  Ndị uweojii azọọla ndị ohi atọ a chọrọ ịgba ọkụ n’Anambra

  Kaosiladị, ọ sị na ndị amị gosiri ndị omekoome ahụ na nwoke na ibe ya hà bụ n’ọnụ, site n’ịgbatù ọtụtụ n’ime ha na iwakpò ebe nzuzo ha ahụ; ndị nke fọrọ afọ wee hapụ ogige ahụ na ihe dị icheiche dị ebe ahụ, rie mbọmbọ ọsọ.

  O kwuru na ihe dị icheiche e nwetara n’ogige ahụ gụnyèrè ọtụtụ ụdị egbe dị icheiche, ọtụtụ mmà, ọtụtụ ụdị ekwentị dị icheiche, igwè laptọọpụ, otu ụgbọala Hilux, akpati ozu, okwu arụsị, na ọtụtụ ọgwụ dị icheiche a gwọrọ agwọ.

  Nke kacha ntị njọ n’ime ihe dị icheiche a hụtara n’ebe ahụ bụ nnukwu olulu e gwuru egwu, ebe ha na-adonye ozu ndị ha gburu egbu, bụkwazị nke ọtụtụ ozu mmadụ juru n’ime ya, ma ndị nke rere ure, ma ndị nke a ka tụnyere ọhụrụ.

  Brigadier General Nwachukwu gwakwazịrị ọhaneze ka ha gaa n’ihu inye ndị ọrụ agha na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ozi dị mkpa ga-enye aka ime ka ọrụ ha na-aga nke ọma n’agha ahụ a na-ebu megide ndị omekoome ahụ. 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here