Ndị ntọ̀ atọhapụla nwaanyị dị ime ha tọọrọ n’ụgbọoloko na Kaduna

0
9

OTU n’ime ụmụnwaanyị dị ime so na ndị a tọọrọ n’ụgbọoloko ndị omekome wakporo na Kaduna, n’ọnwa Maachị abụrụla onye e ji obi ebere wee tọhapụ.

 Nwaanyị nke ọzọ dịkwa ime mụrụ nwa n’ọnwa gara aga n’ebe ahụ e ji ha eji.

 Ka anyị cheta na ndị omekome ahụ wakporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna, ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na asatọ, n’okirikiri Katari na Rijana dị na mpaghara Kaduna. Ha gburu o pekata mpe mmadụ iteghete, merụọ ọtụtụ ahụ ma tọrọkwa ọtụtụ ndị ọzọ.

 N’ihe ngosi onyoonyoo, nwaanyị ahụ dị ime, onye nke a tọhapụrụ kwuru na ndị ntọrị ahụ mesoro ha nke ọma n’ime ebe ahụ e ji ha. O kwuru na ha nọ na-enye ha nri na ọgwụ.

 Ọ sị: “Udo dịrị ụnụ niile. Eso m n’onye njem ndị omekome tọọrọ n’ụgbọoloko na-aga Kaduna, ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na asatọ. Ha kpọrọ anyị baa n’ime ọhịa n’ekwughị ebumnuche ha, ma anyị kelere Chineke n’ihi na ha emesighị anyị ike, ha nyekwara anyị nri nke ọma. Anyị buru onụ anyị na-ebu, ọ bụrụ na ahụ rịaba gị, ha enye gị ọgwụ.”

 Kaosiladị, o kwuru na ha leruru ha anya, o kachasi ya onwe ya di ime omumu, wee jiri obi ebere, tohapu ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here