Nwoke nwunye ya na-eti ihe arịọla ụlọikpe ka e kposa alụmdinanwunye

0
8
Nwaanyị na-eti di ya ihe
Nwaanyị na-eti di ya ihe

OTU onye ọrụugbo aha ya bụ Maazị Williams Famuyibo, rịọrọ ụlọikpe Mapo Grade ‘A’ Customary Court dị n’Ịbadan, steeti Oyo, ka e kposaa alụmdinanwunye ya na nwunye ya bụ Sola, nke ha lụgoro afọ iri atọ na abụọ n’ihi na nwunye ya na-eti ya ihe oge niile.

 Famuyibo, onye bi n’Ibadan kwuru na ya agaghị edinwuzi ihe nwunye ya na-eti ya. Ọ sị: “Agbapụrụ m n’ụlọ anyị kemgbe ọnwa Jenụwarị. Onyenwe m, n’ihi omume ọjọọ Sola na-emeso m, mụ na nwanne m nwoke bizi ugbu a.

 Obi erughị m ala n’ihi na ọ naghị elekọta m anya. Amụtala m ụmụ ise tupu m lụọ Sola n’afọ 1990, ma ha niile na ikwunaibe m ndị ọzọ bi n’ihi omume ọjọọ ọ na-eme.”

 N’akụkụ nke ya, Sola abịaghị n’ụlọikpe ahụ, nke onye Ọkaiwu kwesịrị ịnọchite anya ya n’okwu ahụ ji abịa; n’agbanyeghị na e mere ka ọ mata banyere ọnọdụ ahụ.

 Onyeisi ụlọikpe ahụ, Oriakụ S.M. Akintayo gwazịrị onye ozi (court bailiff) ka o mee ka Sola mata ụbọchị ọzọ e tinyere ikpe ahụ.

 Ya mere, Akintayo higharịrị ikpe ahụ ka ọ dịbazie na Mee 26, maka ileba ya anya gaa n’ihu.

GUO:  Alụmdinanwunye, omenala zuru Igbo ọnụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here