Osote onyeisi uweojii Nigeria abịala njem nleta na steeti Anambra

0
7
DIG Amadi (n'aka nri) oge ndị uweojii steeti Anambra nà-anabàta ya n'isi ụlọọrụ ha dị n'Awka
DIG Amadi (n'aka nri) oge ndị uweojii steeti Anambra nà-anabàta ya n'isi ụlọọrụ ha dị n'Awka

NWA amadi ahụ a kpọlitere ọhụrụ dịka osote onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ngalaba nchọcha na nhazi n’isi ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria dị n’Abuja, bụ DIG Ogbonna Amadi agaala njem nleta n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Anambra dị n’Amawbia, Awka South iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma nwekwa mkparịtụka n’etiti ya na ndị uweojii steeti ahụ.

  Ya bụ osote onyeisi ndị uweojii bụ onye a nabatara na steeti ahụ site n’aka onyeisi ndị uweojii n’Anambra, bụ CP Echeng Echeng na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ uweojii, tinyere ndị ọrụ uweojii nọ n’isi ụlọọrụ ahụ.

  N’ozi nnọ́ọ̀ ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng toro ma kelee DIG Amadi ekele n’ihi mkpọlite ahụ a kpọlitere ya n’ọkwa ọhụrụ ahụ nàkwà mkpọlite a kpọlitere ya dịka onyeisi na-ahụ maka mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ.

  Dịka ọ na-ekele ya maka ngalaba ebe dị icheiche o jegoro ozi n’oge gara aga; CP Echeng tòkwàrà onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman maka nkwàdó ọ na-enye ndị uweojii steeti ahụ, ọkachasị etu o siri hụ na e mere nhọpụ̀ta ọchịchị ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahụ n’ahọ gara aga nke ọma na n’ụzọ udo, n’agbànyeghị ụfọdụ ihe iche aka mgba dị icheiche dapụtara n’oge ahụ.

  O gosipụtara obi mwute ya banyere etu ụfọdụ ndị omekome si akpalite ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ yà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, ọkachasị n’ime ọnwa olenaole gara aga, bụkwazị nke o kwuru na ha na-agbasi mbọ ike iweta ya n’isi njedebe.

GUO:  Gọọmenti Anambra amalitela ịrụ ụzọ ọzọ na Nnewi

  Na nzaghachi ya, DIG Amadi kọwàrà na ebumnobi njem mkpọtụrụ ahụ bụ iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ ma mekwa ka ha na ndị uweojii steeti ahụ mara onwe ha.

  O kpere ka mkpụrụobi ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ lagoro mmụọ maọbu tụfuo ndụ ha n’ihi ajọ ọnọdụ nchekwa dị na steeti ahụ zuo ike udo; ọbụladị dịka o mere ka a mara na ọ dị mkpa iwepụ̀tà usoro bụ ị̀gbà a ga-agbaso wee wètá ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dị na steeti Anambra nà mpaghara ala Igbo na njedebe nke taa, nke echi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here