Soludo ezigala ámụmà ego ọrụ 2022 a hazigharịrị ahazi n’ụlọ omeiwu Anambra

0
9

GỌVANỌ steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ezigala ámụmà ego ọrụ e mezigharịrị emezigharị ewepụtala ndenye ego ruru ijeri naira 170 nke afọ 2022 edegharịrị edegharị n’ihu ụlọ omeiwu steeti Anambra.

  Ya bụ amụma ego ọrụ bụ nke mperi dị na ya siri na otu narị ijeri naịra iri anọ na otu na ụma iteghete wee gbagoo na otu narị ijeri naịra na iri asaa.

  N’okwu ya oge ọ na-agupụ̀tara ndị omeiwu nkọwa ámụmà ego ọrụ ọhụrụ ahụ, o mere ka a mara na pasentị iri isii na anọ n’ime ego ọrụ ahụ bụ màkà ọrụ mmepe obodo; ma kọwakwa na a hụtara mkpa ọ dị ịhazìgharị̀ ego ọrụ ahụ n’ihi etu ọnọdụ akụnụba nà ọnụ ahịa ihe siri dị ugbua.

  Ọ kọ̀wàkwààrà ha ihe ndị ọzọ ha kwesiri ịma banyere ya bụ ámụmà ego ọrụ a hazigharịrị ahazigharị, ma kwe nkwa na a ga-enwe ezi mmekọrịta n’etiti gọọmenti na ndị ọrụ omeiwu steeti ahụ.

  Na ntụnye nke ya, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ  Uchenna Okafor kwupụtàrà nkwenye ọ nwere nà nhazighari ahụ a hazigharịrị ya bụ ámụmà ego ọrụ bụ màkà ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ na mmepe obodo, ya na ime ka ọchịchị steeti ahụ magbuo onwe ya.

  O kwere nkwà na ndị omeiwu ahụ ga-eleba anya n’amuma ego ọrụ ahụ nke ọma na etu ọ kwesiri.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here