Gọọmenti Anambra atụbatala akị oyibo e siri mba Malaysia bulata

0
7
Ụfọdụ akị oyibo ahụ e bulatara a ga-akụ akụ
Ụfọdụ akị oyibo ahụ e bulatara a ga-akụ akụ

EGWURU ma akọchighị bù ụkọ nri, maka na ọ bụ onye gwuru kọchie na-egwute ọzọ echi.

  Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra ebutela ógbè akị oyibo ruru puku iri abụọ (20,000), bụ nke a ga-akụ akụ na steeti ahụ.

  Akị oyibo ahụ bụ nke e siri mba Malaysia wee bute, ma bụrụkwa nke e buru gaa kpọnkwem n’isi ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo, bụ ‘Ministry of Agriculture’ na steeti ahụ, site n’aka òtù ahụ jikọtara ndị na-azụpụta, na-ahazi, ma na-erekwa akụ oyibo n’ala Nigeria, bụ ‘National Coconut Producers, Processors and Marketers Association of Nigeria (NACOPPMAN)’.

  N’okwu ya oge ọ na-anabata akị oyibo ahụ n’aha gọọmenti steeti Anambra, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ, bụ Dọkịta Foster Ihejiofor kwùrù na ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agbasi mbọ ike ma dịkwa ezi njikere ịhụ na e nwere nri gbàànyụụ na steeti ahụ.

  O kwupụtakwara mkpebi ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nwere ime ka ọnọdụ akụnụba steeti ahụ na ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ kwụrụ chịm ma bụrụkwa ejiamaatụ; ma mekwazie ka a mara na ịkwàlite ọrụ ugbo nà ịkụnyesi mkpụrụ nà osisi dị icheiche ná-ényé ego, dịka akụ oyibo, akwụ, na ndị ọzọ, sò n’otu n’ụzọ pụrụ iche a pụrụ isi mezupụta mkpebi ahụ, nke mezịrị gọọmenti ji etinye uchu nke ọma na ya ma na-egosipụtakwa mmasị pụrụ iche na ngalaba ahụ.

  O mere ka a mara na ụfọdụ osisi ndị ọzọ a ga-akụ akụ ka na-abàtakwa, nke gụnyekwara akwụ na osisi ndị ọzọ na-enye ego, dịka a na-atụ anya ma na-akwadobe ịkụ ọtụtụ osisi na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

GUO:  Na Malaysia, mmadụ abụọ anwụọla ka helikọpta abụọ ha ji eme ọzụzụ kpọriri

  Kọmishọna Ihejiofor rioro  ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ, site n’iji ezi ohere ahụ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, bụ ọchịchị Soludo na-ewepụtasị na ntụnye dị icheiche ọ na-eme na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ wee kpọrọ ihe, jirikwa ya kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ha, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ bèlata ụkọ nri, ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba steeti ahụ na ego a na-enweta n’ime ya.

  Ọ dị ncheta na ọrụ ugbo so n’otu n’ime nglaba Gọvanọ Soludo kwere nkwa itinye uchu pụrụ iche na ya n’ihi ọtụtụ uru juputara na ya nàkwà etu nke ahụ ga-esi nye aka n’ịkwàlìtè mmepụta erimeri na steeti ahụ, bụkwazị nke mere o jiri kwuo na a ga-enwe atụmatụ ịkụ ọtụtụ osisi na-enye ego na steeti ahụ, dịka otu n’ime ụzọ a pụrụ isi mezupute ya bụ ọmarịcha ebumnobi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here