Gọọmenti Etiti agbaala Peter Nwachukwu akwụkwọ maka ọnwụ Osinachi nwunye ya

0
7
Peter Nwachukwu oge a na-akpụgharị ya n'ụlọ ikpe
Peter Nwachukwu oge a na-akpụgharị ya n'ụlọ ikpe

GỌỌMENTI etiti ala Nigerịa agbaala Maazị Peter Nwachukwu akwụkwọ, bụ di nwaanyị ahụ na-agụ egwu ụka a ma ama lagoro mmụọ, bụ Oriakụ Osinachi Nwachukwu

 Ebubo a na-ebo ya gụnyere igbu ọchụ na ihe ndị ọzọ megidere ndụ mmadụ.

 Akwụkwọ ahụ nke a gbara ya ka ọnwa Mee dị n’abalị iri abụọ n’afọ a bụ 2022 bụ nke Onyeisi na-ahụ maka ‘Sexual and Gender-Based Violence’ na ngalaba ‘Public Prosecutions’ nke ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ n’ala Nigeria (Federal Ministry of Justice), Oriakụ Yewande Gbola-Awopetun tinyere aka na ya.

 E boro Nwachukwu ebubo na o ji aka ike chụpụ Osinachi n’ụlọ, tinyere ịkwapụ ya n’ụgbọala na-aga aga.

 Ọzọ bụ na o gbochiri ya ezi nnwere onwe dịka mmadụ, site n’igbochi na itinyere ya anya ebe ọ na-aga, ma na-akpọchido ya ụzọ, n’ime ụlọ.

 E bokwara Nwachukwu ebubo na ọ na-akpagbu nwunye ya n’okwu ọnụ ma na omume ọjọọ.

 E kwukwara na o kweghị ka Osinachi wèré ego ya onwe ya gbòó mkpa dịịrị ya, dịka ilekọta ahụike ya na ihe gbasara ezinụlọ, ma si otu ahụ kwanye ya n’ịrịọ arịrịọ na ịgba mbìbì ego

 E kwukwara na o kewara Osinachi na ezinụlọ ya, site n’igbochi nne ya na ụmụnne ya ịbịa be di ya.

 Ọzọ bụkwa na e kwùrù na nwoke ahụ na-eti ụmụ ya ihe oge niile, ma were ekwentị na-ese ha ka ha na-ebe akwa, bụ nke ọ na-emecha n’ikpeazụ na-egosị onyoonyoo ya n’ekwentị.

 N’ebubo niile e boro Nwachukwu, gbasara ụzọ dị icheiche o siri megide nwunye ya, a rụtụchara aka ebe o siri megide iwu ala anyị.

 Ọ dị ncheta na Osinachi nwụrụ n’Epure n’ihi agha ezinụlọ. E kwuru oge ahụ na ọ nwụrụ n’ihi ụkwụ di ya bụ Peter Nwachukwu gbara ya n’obi.

GUO:  Obinabo egosila nwute banyere ọnwụ Osinachi

 Ka ọ dị ugbua, Ministrị na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị n’ala Nigeria ekwela nkwa na gọọmenti ga-ahụ na e nwetàrà nkwụmọtọ, n’okwu ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here