Na Benue, Fada enwetela mmeri iji aha APC zọọ ọkwa Gọvanọ

0
7
Alia

ỤKỌCHUKWU ụka katọlik dayọsis Gboko, nke dị na steeti Benue, Fada Hyacinth Alia enwetela mmeri iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congres (APC) wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue.

  Fada ahụ ka e kwuru na o meriri ndị ya na ha zọrọ ya bụ ọkwa, ndị gụnyere, Banabas Gemade, jibu ọkwa onyeisioche PDP n’ala Nigeria na Mike Aondoakaa, jibu ọkwa ‘Attorney General of the Federation’.

  O nwetara vootu karịrị puku asaa, ebe ụfọdụ ndị ya na ha zọrọ ọkwa enwetaghị ọbụladị otu vootu n’ụfọdụ okpuruọchịchị ime obodo.

  Fada Alia kwuru oge ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe kpaliri mmụọ ya bụ ka ya zọpụta steeti Benue, ma kọwaa na site mgbe ahụ o kpebiri ịza oku ndị nke ya, na o doro ya anya aja chere ya n’ihu, ọ ga-achụ.

  Ọ dị ncheta na Bishop dayọsis Gboko, Most Rev. William Avenya nyere Fada Alia ocheazụ maka ịbanye n’ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na isonye n’ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue, nke a ga-eme na 2023. Ka ọ dị ugbua, ọ gaghị na-arụziri ndị mmadụ ọrụ ụkọchukwu n’ihi ocheazụ ahụ e nyere ya. Ọnọdụ ahụ e nyere ya bụ ka o siri dị n’iwu ụka Katọlik, ‘Cannon Law’.

GUO:  N'Awka, ọtụtụ ndị nọbu APC esuola azịza ha ọkụ, gbaba APGA

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here