Ụlọikpe atụọla onye ocha nga ahọ abụọ maka ịdọkasị akwụkwọ ego Naịra

0
7
Maazị Li Lei Lei na mpempe ego ahụ ọ dọkasịrị
Maazị Li Lei Lei na mpempe ego ahụ ọ dọkasịrị

ỌKAIKPE Nicholas Oweibo nke ụlọikpe ukwu dị n’Ikoyi, steeti Lagos, nọrọ ụbọchị Tuzdee wee ma otu nwoke mba China aha ya bụ Li Lei Lei ikpe ma kabìkwa na a ga-atụ ya nga ahọ abụọ zuru èzù, maka ịdọkasị akwụkwọ ego Naịra.

  Nwoke ahụ bụ onye e kwuru na a gbara ya akwụkwọ ma kpụgharịa ya n’ụlọikpe n’ihi ihe ahụ o mere, bụ nke megidere mpaghara 21(1) nke akwụkwọ iwu nguzobe ụlọ ọba ego etiti ala Nigeria, bụ ‘Central Bank of Nigeria Establishment Act’.

  Dịka ikpe ahụ e kpere ya siri dị, ya bụ nwoke ka e kwuru na ọ nọrọ n’abalị iri na asaa nke ọnwa Mee ahọ a wee dọkasịa otu akwụkwọ ego dị otu puku naịra (N1,000) nke nwere akara 947882 si n’ụlọ ọba ego etiti ala Nigeria wee pụta, bụ nke e kwuru na ọ bụkwa n’ọdụ ụgbọelu ‘Murtala Muhammed International Airport, Lagos’ ka ọ nọrọ wee mee ya, ma bụrụkwa nke megidere mpaghara 21(1) nke akwụkwọ iwu nguzobe ụlọ ọba ego etiti ala Nigeria, bụ ‘Central Bank of Nigeria Establishment Act’ nà mpaghara C4, Vol.1 nke iwu na-achị ala Nigeria, nke ahọ 2010.

  E kwukwara na ya bụ nwoke nọkwàra n’otu ụbọchị ahụ wee dọkasịa otu akwụkwọ ego ọzọ dị otu puku naịra (N1,000) nke nwere akara 114804, bụ nke e kwuru na ọ bụkwa n’ọdụ ụgbọelu ‘Murtala Muhammed International Airport, Lagos’ ka ọ nọrọ wee mee ya, ma bụrụkwa nke megidere mpaghara 21(1) nke akwụkwọ iwu nguzobe ụlọ ọba ego etiti ala Nigeria, bụ ‘Central Bank of Nigeria Establishment Act’ nà mpaghara C4, Vol.1 nke iwu na-achị ala Nigeria, nke ahọ 2010.

GUO:  Ụlọikpe amala atụrụ ikpe, tụọ ya nga ahọ atọ maka isogbu otu nwaanyị

  Ka a gụpụtachara ihe o mere nà iwu dị icheiche ọ dara, Maazị Li Lei Lei kwuru n’ezie na ikpe mara ya, bụkwazị nke mere ka onye ọkaiwu gbárá ya akwụkwọ ahụ, bụ Ayanfe Ogunshina, malite ilebà anya n’okwu ya ahụ n’uju, etu ya bụ ihe siri mee, na ntaramahụhụ dịịrị nwoke ahụ.

  Ọ kọwara na a nwụchiri nwoke ahụ n’ọdụ ụgbọelu ‘Murtala Muhammed International Airport, Lagos’ oge ọ na-achọ ịbà ụgbọelu gaba mba Kenya; ma kọwaa na ọ bụ oge ndị ụlọọọrụ na-ahụ maka ime njem mba ofesi, bụ ụlọọrụ ‘Immigration Service’ na-enyòcha àkpà ya bụ nwoke ji eme njem ka o jiri iwe wee dọkasịa akwụkwọ ego Naịra anọ o ji n’aka ya, nke mkpokọta ya pụtara puku naịra atọ na narị abụọ (N3,200).

  O kwukwazịrị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa Department of State Security (DSS) nwụchikọrọ ya bụ nwoke, wee nyefee ya n’aka ndị ọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) maka ime nnyocha nà ịgba ya akwụkwọ banyere ihe ahụ o mere. O kwuptakwara ihe onye ọcha ahụ kwuru oge e jidechara ya, bụ nke e dere n’asụsụ Mandarin, e wee kọwaa ya n’asụsụ Bekee.

  O gosikwazịrị ụlọikpe akwụkwọ e jiri si n’aka ụlọọrụ DSS wee nyefee nwoke ahụ n’aka EFCC, ma gosikwazie ụlọikpe mpempe akwụkwọ ego ahụ ọ dọkasịrị; ọbụladị dịka ọ rịọrọ ụlọikpe ka e kpee ya ikpe ma nye ya ntaramahụhụ kwesiri ya.

  Oge o lebàchara anya na ya bụ okwu, Ọkaikpe Oweibo chọpụtara n’ezie na ikpe mara nwoke ahụ; o wee kabie na a ga-atụ ya nga ọnwa isii maka ego ọbụla n’ime akwụkwọ ego anọ ahụ ọ dọkara, nke pụtara na ọ ga-anọ n’ụlọ nga ọnwa iri abụọ na anọ zuru ezu (ahọ abụọ) maka ego anọ ahụ ọ dọkasịrị, maọbụkwanụ ọ kwụọ narị puku naịra abụọ (N200, 000.00) wee gbara isi onwe ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here