Anambra emeela Ụbọchị Gburugburu, hibe amụma ịkụ otu nde osisi na steeti

0
5
Kọmishọna Felix Odimegwu (n'aka nri) na Ọkaokwu Uchenna Okafor (n'aka ekpe) mgbe ọ na-eme ihe àtụ̀ ịkụ osisi na mmemme ahụ
Kọmishọna Felix Odimegwu (n'aka nri) na Ọkaokwu Uchenna Okafor (n'aka ekpe) mgbe ọ na-eme ihe àtụ̀ ịkụ osisi na mmemme ahụ

GỌỌMENTI steeti Anambra, n’ụbọchị ụka, sonyèèrè mba ụwa wee merùbé mmemme ụbọchị gburugburu na mba ụwa, nke ahọ 2022.

  Mmemme ahụ, nke wééré ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa nke a nọrọ na ya wee gbapee atụmatụ ịkụ ọtụtụ osisi ruru otu nde n’ime steeti ahụ, nke ọ bụkwa aka na-achị steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo gbapere.

  Gọvanọ Soludo, n’okwu ya, ka ọ na-agbape atụmatụ ịkụ osisi ahụ, nke e mere n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbia, kwùrù na mmemme ahụ bụ nke ebumnobi ya bụ iji gbàá ezinaụlọ ọbụla nọ n’Anambra ume ime ka ha kwàlité ọdịmma gburugburu site n’ịkụ osisi na gburugburu ha dị icheiche. O mèkwàrà ka a mara na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike iguzobe ezi ọnọdụ gburugburu na obodo bụ ị̀gbà na steeti ahụ.

  Dị ka o si kwuo, gburugburu so n’ihe mbụ kwesiri ka a kpachapụrụ anya nke ọma, maka na ọ na-enwe mmetụta pụrụ iche na ndụ mmadụ ma ọ bụrụ na e lekọtaghị ya anya nke ọma maọbụ meso ya etu o kwesiri.

  Ka ọ na-akpọpụta oke idei mmiri, mbize na ihe ndị ọzọ dịka ụfọdụ ihe ịmà aka ndị na-apụ̀takarị site n’akpachapụ̀rụ̀ghị gburugburu ebe obibi mmadụ anya, Gọvanọ Soludo kwuru na ọchịchị ya na-ewepụta usoro kacha mma iji dobe Anambra ọcha, na-ewebatakwa ụzọ kachasị mma a ga-esi na-ekpofu ma na-ejìkwá ahịhịa na atịtị, mekwa ka Anambra chawapụ. N’ịgbasò nke a, ọ kpọkuru ndị Anambra ka ha kwàdó gọọmenti site n’ime ihe nke dịịrị ha, isonyesi ike n’atụmatụ ahụ dị icheiche ọchịchị ya na-ewepụta, ya na izèrè omume ọbụla nwere ike imetọ̀ gburugburu ebe obibi maọbụ wụnyéré gọọmenti aja na garị na mbọ ahụ gọọmentị na-agba.

GUO:  Obianọ akpọọ gọọmenti etiti òkù ọsọ mberede n'ajọ ọnọdụ mbize Anambra

  Na mbụ n’okwu ya gbásárá mpụtara ụbọchị ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti Anambra, Injinia Felix Odimegwu kọwàrà na ụbọchị gburugburu na mba ụwa, nke a na-eme n’ụwa gbaa gburugburu n’abalị ise nke ọnwa Juun ahọ ọbụla, bụ ụbọchị pụrụ iche e wepụtara iji kwalite mgbasa ozi gbasara ọnọdụ gburugburu ebe obibi mmadụ, kwugide mmetọ gburugburu, ma na-agbakwa ndị mmadụ ume ime omume ga-enye aka ịkwàlitè ezi ọnọdụ gburugburu ebe obibi dị mma, iji nye aka ịhụ na e nwere ọdịnihu dị mma.

  Ka ọ na-echetara ndi Anambra na gburugburu ebe obibi bụ ihe mbụ kachasị dị mmadụ mkpa, o nyekwara ndị obodo na ndị ahịa dị na steeti ahụ ntụziaka ka ha malite ime ihe ga-eme ka obodo dị ọcha, achawapụ ka akwụkwọ ndụ, bụrụ nke a haziri ahazi, ma bụrụkwa nke na-adigide, nke o kwuru na ọchịchị Gọvanọ Soludo na-agbasi mbọ ike imezupụ̀ta.

  Na mbụ na mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ nwere n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka iji kwusaa banyere mmemme ahụ na óké ụbọchị ahụ, Kọmishọna Odimegwu dụrụ ndị Anambra ọdụ ka ha gba mbọ bido n’oge mee ka gọọmenti mara banyere ebe ọbụla na-emebi emebi, ebe e nwere ajọ ọnọdụ gburugburu na ebe e nwere mbize na mpaghara ha, tupu ọ kawanye njọ maọbu ghọ̀ọ́ nnukwu mbize; ọbụladị dịka ọ dọkwara aka na ntị megide iwu ụlọ n’elu ọwà mmiri, iji zere idei mmiri.

  Dị ka otu n’ime usoro iji hụ na ndị mmadụ na-etinye uche etu o kwesiri ma na-akpachapụ anya n’ọnọdụ gburugburu ebe obibi ha, Kọmishọna Odimegwu kwùkwàra na ọrụ mmepe ọbụla mmadụ maọbụ otu ọbụla na-abagide na steeti ahụ bido ugbua dịrị gaba ga-enweterịrị nkwàdó ga-egosi na ọ dị ebe kwesiri ekwesi ma bụrụkwa nke agaghị eweta ajọ ọnọdụ gburugburu n’ebe ahụ a na-arụ ya, tupu e bido ịrụ ya.

GUO:  Anambra: Obodo bụ ọka ibe na mmụta

  Mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Naanị Otu Ụwa’, bụkwà nke ndị isi ọchịchị na ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyere na ya, nke gụnyere ụfọdụ ndị ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti ahụ, ndị onyeisi ha bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor duru wee bịa; nwunye onye aka na-achị steeti ahụ, Oriakụ Nonye Soludo; ndi òtù ‘Anambra State Association of Town Unions (ASATU)’, ndị ọ bụ onyeisi òtù ahụ n’ala Nigeria, bụ Ọkaiwu Titus Akpudo duru ha wee bịa; tinyere ndị isi ụlọọrụ gọọmentị dị icheiche na steeti ahụ, nke gụnyere onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation’, Maazị Chuka Nnabuife, na ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here