Buhari ekeleela Queen Elizabeth n’ọ̀gbụ̀gbà ahọ 70 n’ọchịchị

0
5
Onyeisiala Buhari na Ezenwaanyị Elizabeth
Onyeisiala Buhari na Ezenwaanyị Elizabeth

ONYEISIALA Nigeria, Muhammadu Buhari ekeleela Queen Elizabeth nke abụọ, ka o mere afọ iri asaa ọ malitere ọchịchị na mba Britain, nke bekee kpọrọ ‘platinum jubilee’.

  Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Onyeisiala n’ihe gbasara mgbasaozi, Garba Shehu siri kọwaa, Buhari sị na ya sonyeere ezenwaanyị ahụ dịka ọ na-eme emume afọ iri asaa ọ nọọrọla n’ocheeze, tinyere Onyeisi Commonwealth of Nations; nke Nigeria bụ otu n’ime ha.

  Buhari rụtụrụ aka na Queen Elizabeth nke abụọ bụ onye ọchịchị mbụ nke mba Britain nọruru afọ iri asaa n’ocheeze.

 N’ozi ahụ ọ kụpụ̀rụ̀ maka nnukwu mmemme ahụ pụrụ iche, Onyeisiala Buhari rụtụrụ aka na Queen Elizabeth ahụ akpaala ike dị egwu, nke gụnyere ịbụ onye kacha bụrụ nwata wee nọọ n’oche eze ahụ, iji ezi ntụkwasịobi na amara wee na-ahazi ọrụ ya, tinyekwuoro ịbụ onye ọchịchị ya kachagoro too ogologo.

 Onyeisiala gosipụtara afọ ojuju o nwere n’ebe ezenwaanyị ahụ nọ, dịka onye ndu maara ihe ekwe na-akụ, onye ọnọdụ na ọdịmma ndị ọ na-achị na-emetụ n’obi; ma kọwakwaa ya bụ agụ nwaanyị dịka onye na-arụrụ ndị nke ya ọrụ dịka ezi enyi na onye nwere mmetụta, ọbụghị dịka onye ọchịchị.

  Ozi ahụ gara n’ihu sị: “O nweghị mgbe ndị mmadụ ji ewepụ ntụkwasịobi n’ebe Queen Elizabeth nọ. Ha kwesiri ike na ọ na-ama ihe ọ na-eme oge niile, ọ kachasị n’oge nsogbu. Ọ bụkwa eziokwu ghe anya oghe na Queen Elizabeth na-ahazi ihe nke ọma, na-ewepụta atụmatụ ma na-emezupụta ha oge niile, dịka ndị nke ya siri chọ.”

GUO:  Nbuli Bishọp Okpaleke ka ọbụrụ Kadinal ga-abara Nigeria uru – Buhari

 Onyeisiala chetakwara ma kasie ya bụ eze nwaanyị obi n’ọdọdụ ufodụ, dịka di ya ma bụrụkwa onye nkwado ya, Price Philip, Duke nke Edinburgh ka nwụrụ nsonso a. O ji aha ya na nke ụmụ Nigeria niile gọọrọ ya ọfọ ogologo ndụ na ahụike, ma gọziekwa ọdịnihu nke ọchịchị ya dịka ezenwaanyị nke mba England na onyeisi Commonwealth.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here