E mebiela ọtụtụ ebe a na-esucha mmanụ agbidi iwu akwadòghị̀ na Niger Delta

0
5
Ụfọdụ ebe ahụ a na-esucha mmanụ agbidi ndị agha mebiri

ISI ụlọọrụ nchekwa ala Nigeria, Defence Headquarters (DHQ), ekwuputala na ndị agha achọpụtala ma mebie ebe nhanzi mmanụ e gwuputara n’ime ala iwu akwadoghị, bụ nke karịrị iri anọ n’ọnụọgụ, n’ime izuụka abụọ.

  DHQ kwukwara na ndị agha ahụ chọpụtakwara ma mebie ebe a na-agbanye mmanụ e jiri igwe rụọ, nke dị otu narị na iri isii na ise, ovun e ji esi mmanụ dị iri asaa na abụọ, olulu ebe a na-ahazi mmanụ dị iri abụọ na atọ, na ụgbọ mmiri e jiri osisi rụọ dị ise n’ọnụọgụ; ma nweta ihe karịrị otu nde lita mmanụ agbidi, e zuru n’ohi, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

   Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ ndị agha ala Nigeria, bụ Major General Bernard Onyeuko kwuputara nke a, ma mekwa ka a mara na a hafeela ihe ndị ahụ niile e nwetere ebe ahụ na ndị niile e jidekwara n’ebe ahụ n’aka ndị ga-eleba anya na ya bụ okwu.

 Onyeuko, n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyere ọrụ ndị agha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ bụ nke a chịkọbara n’agbata Mee 19 ruo Juunu 2, sị na agha a na-ebuso ihe ọjọọ na mpaghara ‘North East’ egbuola otụtụ ndị omekome (terrorists), ma sị na ha nwetakwara ọtụtụ ngwaagha n’oge mkpocha e megasịrị n’ụfọdụ ime ogbe na steeti Borno.

 Ọ gara n’ihu sị na ndị omekome ahụ, ndị na-enweghị ike ịkwụdonwu agha ndị agha ahụ busoro ha, gbahapụrụ ngwongwo ha na ụfọdụ ndị ezinụlọ ha karịrị otu narị, gbafuo, bụkwazị nke ndị ọrụ agha ahụ nwekọtachara.

  Dịka ọ na-arụtụ aka na ndị agha enyela ndị nche ime obodo ruru otu narị na iri abụọ na abụọ ọzụzụ n’okpuru ọchịchị Sanga dị na steeti Kaduna, ka ha wee nye aka na nchekwa obodo na mpaghara ahụ; Gen.

  Onyeuko sị na n’ime oge ndị ahụ niile, na ndị ọrụ agha akpaala ike dị egwu n’imemila aka ọrụ ndị omekome na mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here