Nbuli Bishọp Okpaleke ka ọbụrụ Kadinal ga-abara Nigeria uru – Buhari

0
4
Bishọp Okpaleke na Onyeisiala Buhari
Bishọp Okpaleke na Onyeisiala Buhari

DỊKA ndị mmadụ na-aga n’ihu na-ekele Chineke maka nhọpụta a họpụtàra Bishọp Okpaleke ịbụ Kadịnal, Onyeisiala Nigeria, Muhammadu Buhari esorola wee kwupụta afọojuju o nwere maka ya bụ nhọpụta Poopu Francis họpụtara nwa afọ Nigeria ịbụ Kadịnal.

  Onyeisiala Buhari, n’ozi ekele ọ kụpụ̀rụ̀ na nsonso a n’Abuja site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye ya n’ihe gbasara mgbasaozi, Mallam Garba Shehu, kwùrù na Bishọp Okpaleke tozuru nkeọma maka ọkwa ahụ, ma gaa n’ihu kwuo na ọnọdụ ya ka Kadinal ga-abara Nigeria uru n’ọtụtụ ụzọ.

  Dịka ọ na-egosịpụta ọṅụ ya maka nhọpụ̀ta ahụ a họpụtara Bishọp Okpaleke nke dayọsis Ekwulobia dị na steeti Anambra, Onyeisiala Buhari mere ka a mara na ya bụ Kadinal a họpụtara ọhụrụ abụrụla Kadịnal nke anọ Nigeria na-enwe. Ndị ọzọ bu ya ụzọ gụnyèrè Francis Arinze, Anthony Okojie na John Onaiyekan. Bishọp Okpaleke sòkwàzị̀ na Kadinal iri abụọ na otu Popu Francis họpụtara n’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Mee ahọ a.

  Dịka Mallam Garba Shehu siri kwuo n’ozi ahụ: “Onyeisiala Buhari toro Popu Francis maka ịchọpụta onye Nigeria tozuru etozu n’ụdịdị Bishọp Okpaleke ịbụ otu n’ime mmadụ abụọ ndị Africa a họpụtara. “O kelekwara ndị otu Kraịst na Nigeria maka nhọpụta ahụ, ma kọwaa onye a họpụtara ịbụ Kadịnal ka onye tozuru etozu, kwuo na ọnọdụ ya n’ọkwa ahụ ga-abara Nigeria uru nke ukwuu n’ọtụtụ ụzọ dị icheiche.”

 Onyeisiala tòrò ụka katọlik maka mbọ ha banyere ịdịnotu, udo na ọganihu Nigeria. Ọ gakwara n’ihu rụtụgasịa aka na mbọ ụka gbara iji gbochie ọrịa korona, tinyere nkwado na-enye ndị ogbenye, ndị nwere nsogbu dị icheiche, na ndị ọnọdụ dịịrị ańaa n’ala Nigeria.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here