Nri ndị Igbo: Otu e si esi ụkpaka na otu e si eri ya

0
4
ụkpaka
ụkpaka

NDỊ Igbo nwere ọtụtụ nri dị iche iche nakwa ihe ndị nọchiri anya magi n’oge gboo dịka ndị a: ụkpaka, okpeyi, ogiri, dawadawa, efu, mkpụrụ ụzịza w.d.g. Ihe ndị a niile nwere ọrụ na ụtọ ha na-enye na nri.

  Anyị ga-amara ka e si esi ụkpaka nakwa otu e si eri ya. Ọbụghị naanị ụtọ ka ụkpaka na-atọ na nri kama ụkpata bụ ọgwụ. N’ezie, Chukwu ji ọtụtụ ihe oriri ọma chọ ndị Igbo mma.

  Otu a ka e si akwado ụkpaka tupu eribe ya: ị kpota mkpụrụ ụkpaka, ị sinye ya n’ọkụ, ị ga-esi ya ka o ghee. Ka ị ga-esi mara na o gheela bụ na ị pịa ya aka, ọ pụta n’okpuru ya, I wepụtachaa ya n’okpokoro ya, bee ya kịrịkịrị sinye ya ọzọ n’ọkụ. Ị ga-esi ya ihe dịka awa atọ tupu ị wụpụ ya na nyọ. Denye/banye ya na mmiri, chi foo, sapụ ya na mmiri ahụ, ńaa akwụkwọ unere n’ọkụ, tinye akwụkwọ ahụ na nyọ, wụnye ụkpaka ahụ n’ime ya, werekwa akwụkwọ ahụ kpuchie ya, ekwekwala ka ijiji be na ya ka ọ ghara ịgba ikpuru. Ọ gaa abalị anọ, ọ bụrụ oriri.

  Otu e si eri ụkpaka: E ji ụkpaka agwọ abacha, e ji ya na akwụkwọ ańara eme ọgwụ ọbara, e ji ụkpaka, ụtazi na mmanụ eri ji a hụrụ n’ọkụ, e ji ụkpaka eri jioko a hụrụ n’ọkụ, e ji ya agwọ achịcha ede. Ọ dịkwa ndị ala Igbo ji ụkpaka esi ofe, mana ihe ha na-akpọ ya bụ ụgba, ha na-eji ụkpaka agwọ okporoko maọbụ anụ ma ha na-eme mmemme. E ji ụkpaka na inine agwọ ji, ede ọkụ/bekee, jioko achaghị acha.

GUO:  Nri ndị Igbo: Achịcha na fịọfịọ

  Ọtụtụ ụzọ dị iche iche ka e ji eri ụkpaka.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here