Eliela ozu Maazi Anigbogu n’Amansea

0
3
Igwe Anigbogu (n'etiti) na ụmụnna ya n'oge mmemme akwamozu ahụ
Igwe Anigbogu (n'etiti) na ụmụnna ya n'oge mmemme akwamozu ahụ

OKE osisi adaala, ụmụ nnụnnụ awarala ọsọ. Obodo Amansea jupụtara na mmadụ n’oge elimozu Maazi Anthony Anigbogu na be ya di na Amaowelle, Amansea nke di n’okpuru ọchịchị Awka North, Anambra Steeti.

  Mmemme a bụ nnọọ nke dọtara ọtụtụ ndi mmadụ n’obodo Amansea nke gunyere ndi enyi na ọgọ, ikwu na ibe nakwa ọtụtụ ndi eji okwu ha agba izu dika Onyeisi Ọchịchị Obodo Amansea Development Union, Maazị Chris Ughanze, Onyeisi Ụlọakwụkwọ Mahadum Nnamdi Azikiwe University, Ọkammụta Charles Esimone nke onye nọchitere anya ya bụ osotaya, Ọkammụta Joseph Ikechebelu, Onyeisi Amansea Amaka Age Grade, Ositadimma Mmuoraa, Ichie Mike Ekwunife, Onyeisi Ahịa Amansea Cattle Maketi, Alhaji Bello Maigari na ndi ọzọgasị gbakọrọ iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

  Elimozu nwaamadi a wuru ewu ebe ndi mmadụ na agbara ya akaebe etu osiri bie ndụ ya nakwa ọdịmma ya n’ebe mmadụ nọ.

  Tupu ọnwụọ dika ọgbachara afọ iri asaa na atọ, Anigbogu bụ papa Eze Ọdịnala Amansea,  Igwe Chukwuma Anigbogu, Chimere Eze I na Amansea ma bụrụ ọnye lala ezumike ọlụ oge ọlụsịrị ọlụ bekee dika onye na-edeba aha ụlọ ikpe dị elu ma lụkwaa ọlụ dika kọmishọna maka ịṅụ iyi.

  Dika a na-gba ya ajụjụ ọnụ, Maazị Aghanze kọwara Anigbogu dika onye na atụ egwu Chineke ndi obodo Amansea hụrụ na anya n’ihi ezi ihụnanya o nwere ebe mmadụ ibe ya nọ nakwa udo na agamnuhu o wetere n’obodo Amansea.

  “Ọ bụ mmadụ guzosiri ike n’ezi ihe nke kwesiri ṅṅomi. Ọ bụ nke a mere ọtụtụ mmadụ jiri gbakọọ na obodo anyị taa. Anyị nwere olileanya n’ụmụ ya ga-eme nke ọma karịa papa ha iji na egosipụta ezi ihe ahụ ejiri mara ya. Anyị ga na-akwadokwa Igwe Chimere Eze nke Amansea ma na ayọ Chineke ka ọ nara nkpuruobi papa anyị Anigbogu na ndokwa ma nye ya ezumuike.”

  N’okwu nke ya, Ọriakụ Igwe, Nneka Anigbogu bụ onye eji Lọlọ Oche Eze Amansea wee mara kọwara nna dị ya dika nnukwu mmadụ ma buru onye na enyere mmadụ ibe ya aka nke ukwuu. Ọ gara n’ihu yọọ ka Chineke were obi ebere ya nabata ya na alaeze ya.

  N’ozi ekele ya, Igwe Chukwuma Anigbogu kelele ndi Amansea niile, ndi enyi ya na ndi na echere ha ezi echiche maka enyemaka ha nyere iji hụ na elimozu nnukwu papa ha gara nke ọma. O kpere ekpere ka Chineke gbazielụ ha ụzọ ma dulaa ha na be ha di iche iche.

  Ndi na eru ụjụ ya gụnyere Chris Anigbogu, Charles, Obiageli, Kamsi, Collins Odoh, ndi ụmụ ụmụ ya nakwa  ndi ọzọgasị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here