INEC ekepụtala ogige iri abụọ na ise ọhụrụ maka ịgbata PVC n’Anambra

0
4
Ebe a na-edebanye aha maka ịgbata akwụkwọ ikike PVC
Ebe a na-edebanye aha maka ịgbata akwụkwọ ikike PVC

 ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka nhazi na nchịkọba nhọpụta ọchịchị n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ ekwuola na ya ekewàpụtakwuola ogige ọhụrụ ruru iri abụọ na ise n’ọnụọgụgụ maka ndebanye aha iji gbata akwụkwọ ikike ọkpụtọrọkpụ e ji atụ akwụkwọ, bụ ‘Permanent Voters Card’ n’ime steeti Anambra.

  Onyeisi ụlọọrụ INEC n’ime steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Orji bụ ya kwupụtara nke a oge ya na ndị nta akụkọ na-enwe mkparịtaụka n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Tuzdee.

  O mere ka a mara na nkewapụta ahụ e kewapụtakwuru ogige ọhụrụ ahụ mezịrị ka mkpokọta ọnụọgụgụ ogige ebe a na-edebanye aha na steeti ahụ dịzie iri asatọ na asaa (87), ma bụrụkwa nke a hụtara dịka ihe dị oke mkpà, iji belata oke nkwokọsị ndị mmadụ n’ogige ebe ndị ọzọ dị icheiche a na-agbata ya bụ akwụkwọ ikike na steeti ahụ.

  Dịka ọ na-eme ka a mara na ogige ọhụrụ ndị ahụ e kepụtara màlitèrè ọrụ n’uju ụbọchị Tuzdee, o kwukwara na e meghesiela ụfọdụ ụlọọrụ INEC ndị e mechibụrụ emechi n’ihi ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

  Dọkịta Orji gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ ahụ ahazigharịala usoro arụmọrụ ya n’ogige ebe ndebanye aha dị icheiche, iji hụ na e nwere ebe dị iche maka ndị bịara idebanye aha maka ịgbata akwụkwọ ikike ọhụrụ, nà ebe ọzọ dị iche maka ndị chọrọ iweghachite akwụkwọ ikike nke ha furu efu, nà ndị chọrọ ibugharị ebe ha na-atụ akwụkwọ.

  O kwuru na ndị chọrọ iweghachite akwụkwọ ikike ha furu efu na ndị chọrọ ibugharị ebe ha na-atụ akwụkwọ nwere ike iji aka ha meere onwe ha nke ahụ site n’iji ekwentị ha maọbụ kọmputa ha banye na websaịtị ụlọọrụ ahụ, karịa ịgaba n’ogige ebe a na-edebanye aha. Kaosiladị, o kwukwara na ha nwekwara ụfọdụ ndị ọrụ ha debere n’ogige ha dị icheiche maka ịhụ maka ndị chọrọ iweghachite akwụkwọ ikike ha furu efu na ndị chọrọ ibugharị ebe ha na-atụ akwụkwọ, iji nyere ndị enweghị ike imenwu ya n’onwe ha aka.

GUO:  Welatanụ aka n'ịchọ mma ụbọchị nhọpụta ọchịchị: INEC gwara ụmụnwaanyị Anambra ga-atụ akwụkwọ

  Ya bụ onyeisi ụlọọrụ INEC n’Anambra kwukwara na ha chụrụ ụfọdụ ndị ọrụ ha n’ọrụ maka mkpesa dị icheiche e nwetara site n’aka ndị mmadụ banyere ha, nke na-ekwu na ha na-ana ụfọdụ ndị bịara ịgbata akwụkwọ ikike ha aka azụ maọbụ na-anapụ ha ego n’ike maka ime nke ahụ.

  O kwuru na ụlọọrụ ahụ anaghị anabata ụdị akparamagwa dị otu ahụ chaachaa, ma chetekwara ndị mmadụ na ịgbata akwụkwọ bụ n’efu, na o nweghịkwa onye ọbụla kwesiri ịkwụ kọbọ maọbụ afụ iji nweta nke ahụ. Ọ kpọkuru ọhaneze ka ha nyere ha aka iji chọpụta ndị ọrụ ha ndị na-ana aka azụ, na-ana ha ego, maọbụ na-eme ihe ndị ọzọ di icheiche ekwesighị ekwesi n’ebe a na-agbata ya bụ akwụkwọ ikike.

  O kwuru onye ọbụla hụtara onye na-eme ihe dị otu ahụ, ya kpọọ maọbụ zitere ha ozi site n’akara ekwentị a 07043528329 banyere nke ahụ ma tinyekwa aha ya na mpaghara ogige ebe ya bụ ihe mere, iji nwee ike ịnwụchikọ onye ọrụ ahụ, maka na nke ahụ megidere usoro iwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here