December 3, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Gọọmenti ekwela nkwà mgbataọsọ dịka iju mmiri wakpòrò ụfọdụ obodo n’Anambra

Ụfọdụ ụlọ iju mmiri ahụ tokpòrò 3

Ụfọdụ ụlọ iju mmiri ahụ tokpòrò 3

ỌSỌ agbaala n’ụfọdụ obodo dị icheiche ugbua n’ime steeti Anambra dịka iju mmiri wara ma tokpò ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ, ugbo ebe a kọrọ ihe, na ebe ndị ọzọ.

  Ya bụ ihe ọdachi iju mmiri ná-áwákárị́ kwà afọ ọbụla, bụ nke wara n’obodo dị icheiche dịgasị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru, ma bụrụkwa nke chụpụ̀gòrò ọtụtụ mmadụ n’ụlọ ha ugbua ma bibisiekwa ihe ha kọrọ n’ugbo.

  Ụfọdụ n’ime obodo ebe ya bụ iju mmiri kachara metụta gụnyèrè Ogwuikpele, Akiri-Ogidi, Atani, Osamala, Umu-Uzu, Odeh, Igbede, Odekpe, Odomagwu, Igbokenyi, na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

  N’okwu ya oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, onyeisi ọchịchị obodo Ogwuikpele, Maazị Madupuo Sunday Victor kwàrà arịrị banyere ihe dị icheiche ha na-agabiga n’ihi ajọ ọnọdụ ahụ, ma kpọọ òkù ka a chọpụta usoro ọkpụtọrọkpụ kacha mma a ga-esi gbochie ya bụ nsogbu ka ọ ghara ịdapụtazị ọzọ.

  Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị obodo Akiri-Ogidi, bụ Maazị Micheal Chukwuse mèkwàrà ka a mara na ajọ ọdachi ahụ metụtara ha n’ọtụtụ ụzọ dị icheiche, nke gụnyere ọnọdụ enweghị ebe obibi, ọnọdụ ihe ụkọ, mkpà ezi nlekọta ahụike, na ọtụtụ mkpà ndị ọzọ. Ọ kpọkukwàzị̀rị̀ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ mberede n’ime steeti ahụ nà n’ala Nigeria, bụ ‘State Emergency Management Agency (SEMA)’ na ‘National Emergency Management Agency (NEMA)’ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa maka na ya bụ ọnọdụ akarịala na.

  N’okwu nke ya banyere ọnọdụ ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Felix Odimegwu kwùrù na gọọmenti ebidola ime ihe gbasara ọnọdụ ahụ, ma kwuo na a ga-arụrụ ndị ahụ ọnọdụ ahụ metụtara ogige ebe ha ga-anọgodi.

  O kwuru na ọnọdụ ahụ bụ nke dị dịka chi siri kee ya, ma kọwaa na ha bidoro n’oge mabara ndị bi na mpaghara ebe ahụ ọkwà maka iju mmiri ahụ, ọbụladị dịka o kwukwàrà na ụlọọrụ SEMA na NEMA na-atụ aro ugbua banyere otu ha ga-esi gbatara ndị ahụ ọnọdụ ahụ metụtara ọsọ enyemaka.

   Kọmishọna Odimegwu mèkwàrà ka a mara na gọọmenti steeti Anambra ezigala ndị ọrụ ahụike na mpaghara ebe ahụ ya bụ ihe mere, iji nyere ndị nọ ebe ahụ aka ma lekọtakwa ọnọdụ ahụike ha.

%d bloggers like this: